Native Bible

Romans 8:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya.

Romans 8:17 in English

Romans 8:17 · Berean Standard Bible

And if we are children, then we are heirs: heirs of God and co-heirs with Christ—if indeed we suffer with Him, so that we may also be glorified with Him.

Context

15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba,* Nna.” 16Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. 17Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya. 18Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. 19Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.