Ndị Rom 4:14
Romans 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla.
Romans 4:14 in English
Romans 4:14 · Berean Standard Bible
For if those who live by the law are heirs, faith is useless and the promise is worthless,
Context
12Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu. 13Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 14Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla. 15Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa. 16Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.