Ndị Rom 3:7
Romans 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”
Romans 3:7 in English
Romans 3:7 · Berean Standard Bible
However, if my falsehood accentuates God’s truthfulness, to the increase of His glory, why am I still condemned as a sinner?
Context
5Ma ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nʼihi ajọ omume anyị? (Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ.) 6Nʼezie, ọ bụghị otu a, ọ bụrụ na ọ bụ otu a, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe? 7Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?” 8Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi. 9Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.