Ndị Rom 2:22
Romans 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi?
Romans 2:22 in English
Romans 2:22 · Berean Standard Bible
You who forbid adultery, do you commit adultery? You who abhor idols, do you rob temples?
Context
20ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu. 21Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi? 22Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi? 23Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ? 24Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.