Ndị Rom 16:19
Romans 16:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ.
Romans 16:19 in English
Romans 16:19 · Berean Standard Bible
Everyone has heard about your obedience, so I rejoice over you. But I want you to be wise about what is good and innocent about what is evil.
Context
17Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu. 18Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike. 19Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ. 20Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. 21Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.