Native Bible

Romans 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.

Romans 15:4 in English

Romans 15:4 · Berean Standard Bible

For everything that was written in the past was written for our instruction, so that through endurance and the encouragement of the Scriptures, we might have hope.

Context

2Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. 3Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”* 4Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya. 5Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere. 6Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.