Native Bible

Romans 15:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka.

Romans 15:26 in English

Romans 15:26 · Berean Standard Bible

For Macedonia and Achaia were pleased to make a contribution for the poor among the saints in Jerusalem.

Context

24Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta. 25Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi. 26Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka. 27Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha. 28Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.