Native Bible

Romans 13:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị.

Romans 13:6 in English

Romans 13:6 · Berean Standard Bible

This is also why you pay taxes. For the authorities are God’s servants, who devote themselves to their work.

Context

4Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ. 5Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche. 6Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị. 7Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu. 8Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.