Ndị Rom 13:3
Romans 13:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị.
Romans 13:3 in English
Romans 13:3 · Berean Standard Bible
For rulers are not a terror to good conduct, but to bad. Do you want to be unafraid of the one in authority? Then do what is right, and you will have his approval.
Context
1Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere. 2Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị. 4Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ. 5Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.