Ndị Rom 13:10
Romans 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
Romans 13:10 in English
Romans 13:10 · Berean Standard Bible
Love does no wrong to its neighbor. Therefore love is the fulfillment of the law.
Context
8Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. 9Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,”* nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.”* 10Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile. 11Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. 12Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.