Ndị Rom 11:18
Romans 11:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu.
Romans 11:18 in English
Romans 11:18 · Berean Standard Bible
do not boast over those branches. If you do, remember this: You do not support the root, but the root supports you.
Context
16Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ. 17Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ. 18Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu. 19Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.” 20Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.