Native Bible

Revelation 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa.

Revelation 9:18 in English

Revelation 9:18 · Berean Standard Bible

A third of mankind was killed by the three plagues of fire, smoke, and sulfur that proceeded from their mouths.

Context

16Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị. 17Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta. 18E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa. 19Ike ịnyịnya ndị a dị nʼọnụ ha, na ọdụdụ ha. Ọdụdụ ha dị ka agwọ, nwee isi agwọ nke ha ji emerụ mmadụ ahụ. 20Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.