Native Bible

Revelation 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara mkpụrụ mmiri na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nʼime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke osisi rechapụrụ ọkụ, e rechapụkwara ahịhịa ndụ niile ọkụ.

Revelation 8:7 in English

Revelation 8:7 · Berean Standard Bible

Then the first angel sounded his trumpet, and hail and fire mixed with blood were hurled down upon the earth. A third of the earth was burned up, along with a third of the trees and all the green grass.

Context

5Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ tinye ya nʼime ite igwe ntakịrị ahụ, tụda ya, ka ọ danye nʼime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nʼụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe niile nʼụwa. 6Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji opi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ. 7Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara mkpụrụ mmiri na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nʼime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke osisi rechapụrụ ọkụ, e rechapụkwara ahịhịa ndụ niile ọkụ. 8Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwu ọkụ nʼime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere osimiri niile chagharịa ghọọ ọbara. 9Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ihe niile dị ndụ dị nʼime osimiri nwụrụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ụgbọ mmiri niile dị nʼelu osimiri lara nʼiyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.