Mkpughe 5:10
Revelation 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”
Revelation 5:10 in English
Revelation 5:10 · Berean Standard Bible
You have made them to be a kingdom and priests to serve our God, and they will reign upon * the earth.”
Context
8Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ. 9Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị,
“I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ
na ịnyakapụ akara ya,
nʼihi na e gburu gị,
ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ,
ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile. 10Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi.
Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.” 11Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ. 12Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị,
“O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu
ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike
na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.