Mkpughe 3:20
Revelation 3:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe.
Revelation 3:20 in English
Revelation 3:20 · Berean Standard Bible
Behold, I stand at the door and knock. If anyone hears My voice and opens the door, I will come in and dine with him, and he with Me.
Context
18Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma. 19Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa. 20Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe. 21Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. Ọ bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya. 22Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.