Mkpughe 22:17
Revelation 22:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.
Revelation 22:17 in English
Revelation 22:17 · Berean Standard Bible
The Spirit and the bride say, “Come!” Let the one who hears say, “Come!” And let the one who is thirsty come, and the one who desires the water of life drink freely.
Context
15Nʼazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị niile na-agba afa, na ndị niile na-akwa iko, na ndị niile na-egbu mmadụ, na ndị niile na-ekpere arụsị, na ndị niile hụrụ ụgha nʼanya ma na-emekwa ya. 16“Mụ onwe m, bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gbara unu ama a nye nzukọ m niile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ na Mkpụrụ Devid. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ na-enwu enwu.” 17Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla. 18Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a. 19Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.