Mkpughe 2:23
Revelation 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.
Revelation 2:23 in English
Revelation 2:23 · Berean Standard Bible
Then I will strike her children dead, and all the churches will know that I am the One who searches minds and hearts, and I will repay each of you according to your deeds.
Context
21Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko. 22Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha. 23Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya. 24Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi,* ‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu, 25ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.