Mkpughe 2:15
Revelation 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike.
Revelation 2:15 in English
Revelation 2:15 · Berean Standard Bible
In the same way, some of you also hold to the teaching of the Nicolaitans.
Context
13Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma ị na-anọgidesi ike nʼaha m. Ị jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, ọ bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi. 14Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.* 15Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike. 16Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha. 17Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.