Native Bible

Revelation 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke.

Revelation 17:3 in English

Revelation 17:3 · Berean Standard Bible

And the angel carried me away in the Spirit into a wilderness, where I saw a woman sitting on a scarlet beast that was covered with blasphemous names and had seven heads and ten horns.

Context

1Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa. 2Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.” 3O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke. 4Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya. 5Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.