Mkpughe 12:14
Revelation 12:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii.
Revelation 12:14 in English
Revelation 12:14 · Berean Standard Bible
But the woman was given two wings of a great eagle to fly from the presence of the serpent to her place in the wilderness, where she was nourished for a time, and times, and half a time.
Context
12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe
ma unu ndị niile bi nʼime ya.
Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri
nʼihi na ekwensu abịakwutela unu.
O jirila oke ọnụma bịakwute unu.
Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.” 13Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ. 14Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii. 15Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ. 16Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.