Mkpughe 1:14
Revelation 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe.* Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike.
Revelation 1:14 in English
Revelation 1:14 · Berean Standard Bible
The hair of His head was white like wool, as white as snow, and His eyes were like a blazing fire.
Context
12Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ. 13Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ,* ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya. 14Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe.* Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike. 15Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị. 16O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.