Abụ Ọma 5:11
Psalms 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
Psalms 5:11 in English
Psalms 5:11 · Berean Standard Bible
But let all who take refuge in You rejoice; let them ever shout for joy. May You shelter them, that those who love Your name may rejoice in You.
Context
9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi.
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;
ha ji ire ha ekwu okwu ụgha. 10Maa ha ikpe, Chineke.
Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha.
Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha,
nʼihi na ha enupula isi megide gị. 11Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ.
Were aka nchebe gị kpuchie ha,
ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị. 12Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.
Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.