Abụ Ọma 37:22
Psalms 37:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
Psalms 37:22 in English
Psalms 37:22 · Berean Standard Bible
Surely those He blesses will inherit the land, but the cursed will be destroyed.
Context
20Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ,
ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ. 21Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,
ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. 22Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa,
ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ. 23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,
ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; 24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,
nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.