Abụ Ọma 23:6
Psalms 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi. 23:5 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a. 23:5 Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.
Psalms 23:6 in English
Psalms 23:6 · Berean Standard Bible
Surely goodness and mercy will follow me all the days of my life, and I will dwell in the house of the LORD forever.
Context
4A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul* nʼihu m,
nʼanya ndị iro m.
I tere isi m mmanụ*
iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị
mgbe niile ebighị ebi.
23:5 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a.
23:5 Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.