Abụ Ọma 18:13
Psalms 18:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
Psalms 18:13 in English
Psalms 18:13 · Berean Standard Bible
The LORD thundered from heaven; the voice of the Most High resounded— hailstones and coals of fire.*
Context
11O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 12Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii
ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga. 13Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;
olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. 14Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,
o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. 15E kpughere ala ala nke oke osimiri,
gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,
site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị,
na nkuume si gị nʼimi pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.