Native Bible

Psalms 17:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi.

Psalms 17:2 in English

Psalms 17:2 · Berean Standard Bible

May my vindication come from Your presence; may Your eyes see what is right.

Context

1O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ. 2Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi. 3Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị. 4Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.