Abụ Ọma 17:14
Psalms 17:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.
Psalms 17:14 in English
Psalms 17:14 · Berean Standard Bible
from such men, O LORD, by Your hand— from men of the world whose portion is in this life. May You fill the bellies of Your treasured ones * and satisfy their sons, so they leave their abundance to their children.
Context
12Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa,
dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu. 13Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha.
Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume. 14O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a,
site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a.
Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha,
ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a,
ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha. 15Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume;
mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.