Abụ Ọma 145:6
Psalms 145:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
Psalms 145:6 in English
Psalms 145:6 · Berean Standard Bible
They will proclaim the power of Your awesome deeds, and I will declare Your greatness.
Context
4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ;
ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche. 5Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị,
aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile. 6Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile,
aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile. 7Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu
jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị. 8Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko,
ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.