Abụ Ọma 135:7
Psalms 135:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
Psalms 135:7 in English
Psalms 135:7 · Berean Standard Bible
He causes the clouds to rise from the ends of the earth. He generates the lightning with the rain and brings forth the wind from His storehouses.
Context
5Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu,
na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile. 6Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya
nʼeluigwe na elu ụwa
na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile. 7Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa.
Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo.
Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile. 8O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt,
ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ. 9O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt,
megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.