Ilu 6:16
Proverbs 6:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
Proverbs 6:16 in English
Proverbs 6:16 · Berean Standard Bible
There are six things that the LORD hates, seven that are detestable to Him:
Context
14Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ,
onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile. 15Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede;
nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya. 16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị,
e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. 17Anya dị nganga,
ire na-ekwu okwu ụgha,
aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ. 18Obi na-echepụta nzube ọjọọ;
ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.