Proverbs 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
Proverbs 4:6 in English
Proverbs 4:6 · Berean Standard Bible
Do not forsake wisdom, and she will preserve you; love her, and she will guard you.
Context
4ọ ziri m ihe, sịkwa m,
“Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,
debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ. 5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị. 6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,
hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị. 7Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,
ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta. 8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.
Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.