Native Bible

Philippians 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.

Philippians 4:16 in English

Philippians 4:16 · Berean Standard Bible

For even while I was in Thessalonica, you provided for my needs again and again.

Context

14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. 15Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. 16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. 17Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru. 18Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.