Ndị Filipai 3:9
Philippians 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.
Philippians 3:9 in English
Philippians 3:9 · Berean Standard Bible
and be found in Him, not having my own righteousness from the law, but that which is through faith in Christ,* the righteousness from God on the basis of faith.
Context
7Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst. 8E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru. 9Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe. 10Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ. 11Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.