Native Bible

Philippians 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.

Philippians 3:15 in English

Philippians 3:15 · Berean Standard Bible

All of us who are mature should embrace this point of view. And if you think differently about some issue, God will reveal this to you as well.

Context

13Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. 14Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst. 15Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a. 16Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela. 17Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.