Native Bible

Philippians 2:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.

Philippians 2:28 in English

Philippians 2:28 · Berean Standard Bible

Therefore I am all the more eager to send him, so that when you see him again you may rejoice, and I may be less anxious.

Context

26Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga. 27Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute. 28Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe. 29Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya. 30Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ. 2:15 Dit 32:5

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.