Ndị Filipai 1:29
Philippians 1:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.
Philippians 1:29 in English
Philippians 1:29 · Berean Standard Bible
For it has been granted to you on behalf of Christ not only to believe in Him, but also to suffer for Him,
Context
27Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma, 28na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa. 29Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya. 30Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.
1:1 Ndị okenye ndị a na-ekwu nʼebe bụ ndị ahọpụtara ka ha na-eje ozi nʼokpuru ụkọchukwu maọbụ onye nlekọta nzukọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.