Fịlịmọn 1:7
Philemon 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
Philemon 1:7 in English
Philemon 1:7 · Berean Standard Bible
I take great joy and encouragement in your love, because you, brother, have refreshed the hearts of the saints.
Context
5Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile. 6Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst. 7Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị. 8Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a. 9Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.