Native Bible

Numbers 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa.*

Numbers 9:17 in English

Numbers 9:17 · Berean Standard Bible

Whenever the cloud was lifted from above the Tent, the Israelites would set out, and wherever the cloud settled, there the Israelites would camp.

Context

15Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya. 16Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ. 17Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa.* 18Mgbe Onyenwe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha. 19Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu Onyenwe anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.