Ọnụọgụgụ 8:14
Numbers 8:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.
Numbers 8:14 in English
Numbers 8:14 · Berean Standard Bible
In this way you shall separate the Levites from the rest of the Israelites, and the Levites will belong to Me.
Context
12“Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị. 13Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị. 14Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị. 15“Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe,* ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha. 16Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.