Native Bible

Numbers 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha wetara dịka onyinye ha nye Onyenwe anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ.

Numbers 7:3 in English

Numbers 7:3 · Berean Standard Bible

They brought as their offering before the LORD six covered carts and twelve oxen—an ox from each leader and a cart from every two leaders—and presented them before the tabernacle.

Context

1Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile. 2Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha. 3Ha wetara dịka onyinye ha nye Onyenwe anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ. 4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 5“Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.