Native Bible

Numbers 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.

Numbers 7:10 in English

Numbers 7:10 · Berean Standard Bible

When the altar was anointed, the leaders approached with their offerings for its dedication and presented them before the altar.

Context

8Nye ụmụ Merari, ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta Itama nwa Erọn, onye nchụaja. 9Mosis enyeghị ụmụ Kohat ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu. 10Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.” 12Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.