Native Bible

Numbers 6:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ.

Numbers 6:19 in English

Numbers 6:19 · Berean Standard Bible

And the priest is to take the boiled shoulder from the ram, one unleavened cake from the basket, and one unleavened wafer, and put them into the hands of the Nazirite who has just shaved the hair of his consecration.

Context

17Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ. 18“ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ. 19“ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ. 20Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya. 21“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.