Ọnụọgụgụ 5:28
Numbers 5:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
Numbers 5:28 in English
Numbers 5:28 · Berean Standard Bible
But if the woman has not defiled herself and is clean, she will be unaffected and able to conceive children.
Context
26Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ. 27Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu,* akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya. 28Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ. 29“ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya. 30Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.