Ọnụọgụgụ 5:25
Numbers 5:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja.
Numbers 5:25 in English
Numbers 5:25 · Berean Standard Bible
The priest shall take from her hand the grain offering for jealousy, wave it before the LORD, and bring it to the altar.
Context
23“ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ. 24Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu. 25Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja. 26Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ. 27Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu,* akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.