Ọnụọgụgụ 5:16
Numbers 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị.
Numbers 5:16 in English
Numbers 5:16 · Berean Standard Bible
The priest is to bring the wife forward and have her stand before the LORD.
Context
14ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya, 15nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma. 16“ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị. 17*Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ. 18Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.