Ọnụọgụgụ 5:12
Numbers 5:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ
Numbers 5:12 in English
Numbers 5:12 · Berean Standard Bible
“Speak to the Israelites and tell them that if any man’s wife goes astray and is unfaithful to him
Context
10Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ ” 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 12“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ 13site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ), 14ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.