Ọnụọgụgụ 4:32
Numbers 4:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.
Numbers 4:32 in English
Numbers 4:32 · Berean Standard Bible
and the posts of the surrounding courtyard with their bases, tent pegs, and ropes, including all their equipment and everything related to their use. You shall assign by name the items that they are responsible to carry.
Context
30Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị. 31Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile; 32tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya. 33Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.” 34Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.