Ọnụọgụgụ 4:12
Numbers 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.
Numbers 4:12 in English
Numbers 4:12 · Berean Standard Bible
They are to take all the utensils for serving in the sanctuary, place them in a blue cloth, cover them with fine leather, and put them on the carrying frame.
Context
10Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya. 11“Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ. 12“Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha. 13“A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ. 14Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.