Native Bible

Numbers 36:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”

Numbers 36:9 in English

Numbers 36:9 · Berean Standard Bible

No inheritance may be transferred from one tribe to another, for each tribe of Israel must retain its inheritance.”

Context

7O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha. 8Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ. 9Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.” 10Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 11Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.