Ọnụọgụgụ 32:29
Numbers 32:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.
Numbers 32:29 in English
Numbers 32:29 · Berean Standard Bible
And Moses said to them, “If the Gadites and Reubenites cross the Jordan with you, with every man armed for battle before the LORD, and the land is subdued before you, then you are to give them the land of Gilead as a possession.
Context
27Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.” 28Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha, 29Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha. 30Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala Kenan.” 31Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.